Ọrụ Ndị Ozi 20

Ha kulitere nwokorobịa ahụ na ndụ nke mere ka ọṅụ jupụta ha nʼobi. Ọ gbakwara ha ume nke ukwuu.

Acts 20:12 (UKJV) And they brought the young man alive, and were not a little comforted.

10Pọl rituru nʼala selite ya elu jikụọ ya. Ọ sịrị ndị gbakọrọ nʼebe ahụ sị, “Ka obi hapụ ịlọ unu mmiri ọ dị ndụ.”

11Ọ laghachikwara nʼụlọ elu ahụ, mgbe ọ nyawachara achịcha ma riekwa, o kwugidere okwu tutu chi abọọ, ọ hapụrụ ha bilie ije ya.

12Ha kulitere nwokorobịa ahụ na ndụ nke mere ka ọṅụ jupụta ha nʼobi. Ọ gbakwara ha ume nke ukwuu.

13Anyị onwe anyị gara nʼihu banye nʼụgbọ mmiri chee ihu ịga Asọs. Ebe anyị zubere iburu Pọl nʼụgbọ anyị. O soghị anyị nʼihi na o zubere iji ụkwụ ruo ebe ahụ.

14Mgbe o zutere anyị nʼAsọs, anyị buru ya nʼụgbọ gaa Mitilen.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.