24Ma akpọghị m ndụ m ihe ọbụla. Karịa naanị ka m gbazuo ọsọ m ma jezuokwa ozi ahụ m natara nʼaka Onyenwe anyị Jisọs, nke bụ ịkọwa banyere oziọma nke amara Chineke.
25“Ma ugbu a, amaara m na o nweghị onye ọbụla nʼime unu, bụ ndị m jegharịrị nʼetiti ha na-ezisara ihe banyere alaeze a ga-ahụ m anya ọzọ.
26Ya mere, ana m agwasị unu ike, taa, na abụ m onye aka ya dị ọcha nʼebe ọbara onye ọbụla nʼime unu dị.
27Nʼihi na-esepụghị m aka ikwupụta nzọpụta Chineke nye unu.
28Ma ugbu a, kpacharanụ anya! Leziekwanụ onwe unu na igwe atụrụ nke Mmụọ Nsọ mere unu ndị nlekọta anya ya. Ka unu bụrụ ndị ọzụzụ atụrụ nke chọọchị Chineke, bụ nke o ji ọbara ya zụtara onwe ya.