1Mgbe anyị hapụsịrị ha, anyị nyapụrụ ụgbọ anyị bịaruo Kos. Nʼechi ya, anyị rutere Rods. Anyị sitere nʼebe ahụ jeruo Patara.
2Mgbe anyị hụrụ ụgbọ mmiri na-aga Fonisia, anyị banyere nʼime ya kwọpụ.
3Mgbe anyị kwọruru ụgbọ anyị ebe anyị nwere ike ịhụ Saiprọs, anyị siri nʼaka ekpe ya gafee, ruo Siria. Anyị rutere nʼọnụ mmiri Taịa, ebe ụgbọ mmiri ga-akwapụ ibu dị nʼime ya.
4Mgbe anyị chọtara ndị na-eso ụzọ ahụ, anyị nọnyere ha abalị asaa. Ha gwara Pọl site nʼike nke Mmụọ Nsọ, ka ọ ghara ịga Jerusalem.