Ọrụ Ndị Ozi 21

Mgbe anyị chọtara ndị na-eso ụzọ ahụ, anyị nọnyere ha abalị asaa. Ha gwara Pọl site nʼike nke Mmụọ Nsọ, ka ọ ghara ịga Jerusalem.

Acts 21:4 (UKJV) And finding disciples, we tarried there seven days: who said to Paul through the Spirit, that he should not go up to Jerusalem.

2Mgbe anyị hụrụ ụgbọ mmiri na-aga Fonisia, anyị banyere nʼime ya kwọpụ.

3Mgbe anyị kwọruru ụgbọ anyị ebe anyị nwere ike ịhụ Saiprọs, anyị siri nʼaka ekpe ya gafee, ruo Siria. Anyị rutere nʼọnụ mmiri Taịa, ebe ụgbọ mmiri ga-akwapụ ibu dị nʼime ya.

4Mgbe anyị chọtara ndị na-eso ụzọ ahụ, anyị nọnyere ha abalị asaa. Ha gwara Pọl site nʼike nke Mmụọ Nsọ, ka ọ ghara ịga Jerusalem.

5Mgbe anyị nọzuru ụbọchị anyị, anyị hapụrụ ha, bilie ije. Ha na nwunye ha na ụmụ ha so dupu ruo mgbe anyị si nʼobodo ahụ pụọ. Anyị na ha gburu ikpere nʼala nʼọnụ mmiri kpee ekpere.

6Mgbe ahụ, anyị kelere onwe anyị ekele ikpeazụ. Emesịa, anyị banyere nʼime ụgbọ, ma ha laghachiri azụ nʼụlọ ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.