Ọrụ Ndị Ozi 21

Gịnị ka anyị ga-eme ugbu a? O doro anya na ha ga-amata na ị bịara nʼebe a.

Acts 21:22 (UKJV) What is it therefore? the multitude must essentially come together: for they will hear that you are come.

20Mgbe ha nụchara nke a, ha nyere Chineke otuto. Emesịa, ha sịrị Pọl, “Leenụ nwanna, otu ọtụtụ puku ndị Juu si bụrụ ndị kwere ekwe, ha niile ka ihe banyere iwu a na-anụ ọkụ nʼobi.

21A kọọrọla ha ihe banyere gị, na ị na-ezi ndị Juu bi nʼetiti ndị mba ọzọ ka ha hapụ ịgbasokwa iwu Mosis, na ka ha kwụsịkwa ibi ụmụ ha ugwu maọbụ bie ndụ nʼusoro omenaala anyị.

22Gịnị ka anyị ga-eme ugbu a? O doro anya na ha ga-amata na ị bịara nʼebe a.

23Ya bụ, jisie ike mee ihe anyị ga-agwa gị ugbu a. Anyị nwere mmadụ anọ nʼebe a, ndị nọ na nkwa ha kwere Chineke.

24Soro ha mee omenaala ahụ nke ndị nọ na nkwa ji edo onwe ha ọcha. Kwụọrọ ha ụgwọ maka ịkpụcha isi ha. I mee otu a, mmadụ niile ga-amata na eziokwu adịghị nʼihe ndị a niile e kwuru maka gị, kama na gị onwe gị na-agazi ma na-edebekwa iwu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.