Ọrụ Ndị Ozi 21

Ya bụ, jisie ike mee ihe anyị ga-agwa gị ugbu a. Anyị nwere mmadụ anọ nʼebe a, ndị nọ na nkwa ha kwere Chineke.

Acts 21:23 (UKJV) Do therefore this that we say to you: We have four men which have a vow on them;

21A kọọrọla ha ihe banyere gị, na ị na-ezi ndị Juu bi nʼetiti ndị mba ọzọ ka ha hapụ ịgbasokwa iwu Mosis, na ka ha kwụsịkwa ibi ụmụ ha ugwu maọbụ bie ndụ nʼusoro omenaala anyị.

22Gịnị ka anyị ga-eme ugbu a? O doro anya na ha ga-amata na ị bịara nʼebe a.

23Ya bụ, jisie ike mee ihe anyị ga-agwa gị ugbu a. Anyị nwere mmadụ anọ nʼebe a, ndị nọ na nkwa ha kwere Chineke.

24Soro ha mee omenaala ahụ nke ndị nọ na nkwa ji edo onwe ha ọcha. Kwụọrọ ha ụgwọ maka ịkpụcha isi ha. I mee otu a, mmadụ niile ga-amata na eziokwu adịghị nʼihe ndị a niile e kwuru maka gị, kama na gị onwe gị na-agazi ma na-edebekwa iwu.

25Ma nʼebe ndị mba ọzọ kwere ekwe nọ, anyị edegarala ha akwụkwọ gwa ha kwụsị iri ihe ọbụla a chụrụ nʼaja nye arụsị, na iri ọbara, maọbụ anụ a nyagburu anyagbu, ya na ịkwa iko.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.