30Ọgbaaghara jupụtara nʼobodo ahụ niile. Ndị mmadụ gbakọtara dọkpụpụta Pọl site nʼụlọnsọ ukwu ahụ. Nʼotu mgbe ahụ, e mechiri ọnụ ụzọ niile.
31Mgbe ha na-achọ igbu ya, ozi ruru ọchịagha ntị na Jerusalem niile nọ nʼọgbaaghara.
32Otu mgbe ahụ o duuru ụfọdụ ndịisi agha ya na ndị agha ya mee ngwangwa bịaruo nʼebe ha nọ. Mgbe ha hụrụ ndị agha ka ha na-abịa, ha kwụsịrị iti Pọl ihe.
33Ọchịagha ahụ bịara jide ya, nye iwu ka e were ụdọ igwe abụọ kee ya agbụ, ọ jụkwara onye ọ bụ na ihe o mere.
34Ụfọdụ nʼime igwe mmadụ ahụ na-eti mkpu na-ekwu otu ihe, ebe ụfọdụ na-eti na-ekwu ihe ọzọ. Mgbe ọ na-apụghị ịchọpụta ihe bụ isi mkpọtụ na ọgbaaghara ahụ, o nyere iwu ka e duru ya gaa nʼogige ndị agha.