28na-eti mkpu, “Ndị ikom Izrel, nyerenụ anyị aka! Onye a bụ nwoke ahụ na-ejegharị nʼebe niile na-ezi ozizi megidere ndị nke anyị, iwu anyị nakwa ebe a. Ma nke kachasị nke, ọ merụọkwala ụlọnsọ a site nʼịkpọbata ndị Griik nʼime ya.”
29(Nʼihi na ha ebula ụzọ hụ ya na Trofimọs onye Efesọs nʼime obodo, ha chere na Pọl kpọbatara ya nʼụlọnsọ ukwu ahụ.)
30Ọgbaaghara jupụtara nʼobodo ahụ niile. Ndị mmadụ gbakọtara dọkpụpụta Pọl site nʼụlọnsọ ukwu ahụ. Nʼotu mgbe ahụ, e mechiri ọnụ ụzọ niile.
31Mgbe ha na-achọ igbu ya, ozi ruru ọchịagha ntị na Jerusalem niile nọ nʼọgbaaghara.
32Otu mgbe ahụ o duuru ụfọdụ ndịisi agha ya na ndị agha ya mee ngwangwa bịaruo nʼebe ha nọ. Mgbe ha hụrụ ndị agha ka ha na-abịa, ha kwụsịrị iti Pọl ihe.