Ọrụ Ndị Ozi 21

(Nʼihi na ha ebula ụzọ hụ ya na Trofimọs onye Efesọs nʼime obodo, ha chere na Pọl kpọbatara ya nʼụlọnsọ ukwu ahụ.)

Acts 21:29 (UKJV) (For they had seen before with him in the city Trophimus an Ephesian, whom they supposed that Paul had brought into the temple.)

27Ma mgbe ọ fọdụrụ nwa oge nta ka ụbọchị asaa ahụ gwụchaa, ụfọdụ ndị Juu si Eshịa bịa hụrụ ya nʼụlọnsọ ukwu ahụ. Ha tikuru igwe mmadụ ma kpaliekwa ha. Ha jidere ya,

28na-eti mkpu, “Ndị ikom Izrel, nyerenụ anyị aka! Onye a bụ nwoke ahụ na-ejegharị nʼebe niile na-ezi ozizi megidere ndị nke anyị, iwu anyị nakwa ebe a. Ma nke kachasị nke, ọ merụọkwala ụlọnsọ a site nʼịkpọbata ndị Griik nʼime ya.”

29(Nʼihi na ha ebula ụzọ hụ ya na Trofimọs onye Efesọs nʼime obodo, ha chere na Pọl kpọbatara ya nʼụlọnsọ ukwu ahụ.)

30Ọgbaaghara jupụtara nʼobodo ahụ niile. Ndị mmadụ gbakọtara dọkpụpụta Pọl site nʼụlọnsọ ukwu ahụ. Nʼotu mgbe ahụ, e mechiri ọnụ ụzọ niile.

31Mgbe ha na-achọ igbu ya, ozi ruru ọchịagha ntị na Jerusalem niile nọ nʼọgbaaghara.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.