Ọrụ Ndị Ozi 21

Igwe mmadụ ahụ so ha nọ na-eti mkpu, “Wepụnụ ya! Wepụnụ ya!”

Acts 21:36 (UKJV) For the multitude of the people followed after, crying, Away with him.

34Ụfọdụ nʼime igwe mmadụ ahụ na-eti mkpu na-ekwu otu ihe, ebe ụfọdụ na-eti na-ekwu ihe ọzọ. Mgbe ọ na-apụghị ịchọpụta ihe bụ isi mkpọtụ na ọgbaaghara ahụ, o nyere iwu ka e duru ya gaa nʼogige ndị agha.

35Mgbe o rutere na mgbagolite ọnụ ụzọ ụlọ ahụ, ndị agha bulitere ya elu nʼihi ọgbaaghara igwe ndị mmadụ dị ukwuu.

36Igwe mmadụ ahụ so ha nọ na-eti mkpu, “Wepụnụ ya! Wepụnụ ya!”

37Mgbe ha chọrọ iduba Pọl nʼime ogige ahụ, ọ sịrị ọchịagha ahụ, “Ị ga-ekwe ka m gwa gị okwu?” Ọ sịrị, “I maara asụ asụsụ ndị Griik?

38Ọ pụtara na ị bụghị onye Ijipt ahụ malitere ọgbaaghara ma duuru puku ndị ogbu mmadụ anọ gbalaa nʼọzara?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.