36Igwe mmadụ ahụ so ha nọ na-eti mkpu, “Wepụnụ ya! Wepụnụ ya!”
37Mgbe ha chọrọ iduba Pọl nʼime ogige ahụ, ọ sịrị ọchịagha ahụ, “Ị ga-ekwe ka m gwa gị okwu?” Ọ sịrị, “I maara asụ asụsụ ndị Griik?
38Ọ pụtara na ị bụghị onye Ijipt ahụ malitere ọgbaaghara ma duuru puku ndị ogbu mmadụ anọ gbalaa nʼọzara?”
39Pọl sịrị, “Abụ m onye Juu si Tasọs, obodo dị na Silisia, nwa afọ oke obodo amara aha ya. Biko, kwee ka m gwa ndị mmadụ okwu.”
40Mgbe o nyere ya ikike, Pọl guzooro nʼihe nrigo nke ọnụ ụzọ ahụ fee aka ya ime ka ha nọọ duu. Mgbe ha nọdụrụ nwayọọ, ọ gwara ha okwu nʼasụsụ Hibru sị,