6“Nʼetiti ehihie, mgbe m na-aga nʼụzọ, nʼebe dị Damaskọs nso, oke ìhè nke si nʼeluigwe, chara gburugburu m.
7Adara m nʼala ma nụkwa olu gwara m okwu sị m, ‘Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m?’
8“ ‘Onye ka ị bụ Onyenwe m?’ Ka m jụrụ. “Ọ sịrị m, ‘Abụ m Jisọs onye Nazaret onye ị na-akpagbu.’
9Ndị mụ na ha so hụkwara ìhè ahụ, ma ha anụghị olu onye ahụ na-agwa m okwu.
10“Asịrị m, ‘Gịnị ka m ga-eme Onyenwe anyị?’ “Onyenwe anyị sịrị m, ‘Bilie banye Damaskọs; nʼebe ahụ a ga-agwa gị ihe niile a kwadobere na ị ga-eme.’