4Akpagburu m ndị niile na-eso ụzọ ọhụrụ a, na-etinye ha nʼaka ọnwụ. Ejidere m ndị ikom na ndị inyom ha tụbakwa ha nʼụlọ mkpọrọ.
5Ma dịka onyeisi nchụaja na nzukọ ndị okenye niile pụrụ ịgbara m akaebe. Anatakwara m nʼaka ha akwụkwọ ozi e deere ụmụnna anyị nọ na Damaskọs. Agara m ebe ahụ ịkpụta ha nʼagbụ bịa Jerusalem maka ịta ha ahụhụ.
6“Nʼetiti ehihie, mgbe m na-aga nʼụzọ, nʼebe dị Damaskọs nso, oke ìhè nke si nʼeluigwe, chara gburugburu m.
7Adara m nʼala ma nụkwa olu gwara m okwu sị m, ‘Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m?’
8“ ‘Onye ka ị bụ Onyenwe m?’ Ka m jụrụ. “Ọ sịrị m, ‘Abụ m Jisọs onye Nazaret onye ị na-akpagbu.’