16Ma nwa nwanne nwanyị Pọl nụrụ maka izuzu ọjọọ a. Ọ banyere nʼogige ndị agha kọọrọ Pọl.
17Pọl kpọrọ otu nʼime ndịisi agha ahụ gwa ya, “Biko kpọrọ nwokorobịa a gaa nʼebe ọchịagha nọ, o nwere okwu dị mkpa ọ chọrọ ịgwa ya.”
18Ọ kpọọrọ ya jekwuru onyeisi agha, sị. “Pọl, onye mkpọrọ, kpọrọ m rịọ m ka m kpọtara gị nwokorobịa a nʼihi na o nwere ihe ọ chọrọ ịgwa gị.”
19Onyeisi agha ahụ duuru ya nʼaka ya gaa nʼakụkụ ọzọ jụọ ya, “Gịnị bụ ihe ị chọrọ ịkọrọ m?”
20Ọ sịrị, “Ndị Juu ụfọdụ ekwekọrịtala ịrịọ gị ka ị kpọpụta Pọl echi na nzukọ ụlọ ikpe. Ha ga-eme dịka ha nwere ihe dị mkpa ha chọrọ ịjụta ya.