29Ma achọpụtara m na ọ bụ ihe banyere iwu ha. Nʼeziokwu, o nweghị ihe ọbụla kwesiri iji tụọ ya mkpọrọ maọbụ ọnwụ nʼime ebubo ahụ.
30Mgbe a gwara m banyere izuzu a na-agba megide nwoke a, ezitere m gị ya nʼegbughị oge. Enyekwara m ndị niile na-ebo ya ebubo iwu, ka ha bịa nʼihu gị kpee ọnụ ha.
31Ya mere, nʼabalị ahụ, ndị agha dubatara Pọl na Antipatris dịka e nyere ha nʼiwu.
32Nʼechi ya, ha hapụrụ ya na ndị na-agba nʼelu ịnyịnya ka ha duru ya gawa, ebe ha laghachiri nʼogige ndị agha.
33Mgbe ha bịarutere Sizaria, ha nyere onyeisi obodo ahụ akwụkwọ ozi, ma kpọnyekwa ya Pọl.