Ọrụ Ndị Ozi 23

Mgbe ha bịarutere Sizaria, ha nyere onyeisi obodo ahụ akwụkwọ ozi, ma kpọnyekwa ya Pọl.

Acts 23:33 (UKJV) Who, when they came to Caesarea and delivered the epistle to the governor, presented Paul also before him.

31Ya mere, nʼabalị ahụ, ndị agha dubatara Pọl na Antipatris dịka e nyere ha nʼiwu.

32Nʼechi ya, ha hapụrụ ya na ndị na-agba nʼelu ịnyịnya ka ha duru ya gawa, ebe ha laghachiri nʼogige ndị agha.

33Mgbe ha bịarutere Sizaria, ha nyere onyeisi obodo ahụ akwụkwọ ozi, ma kpọnyekwa ya Pọl.

34Gọvanọ ahụ gụrụ akwụkwọ ozi ahụ, jụọ ya akụkụ ala o si pụta. Mgbe ọ matara na ọ bụ onye Silisia,

35ọ sịrị ya, “Aga m enye okwu gị ezigbo ohere mgbe ndị na-ebo gị ebubo bịara.” O nyekwara iwu ka e debe ya nʼobi Herọd nʼaka ndị nche.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.