3Ma Pọl, sịrị ya, “Otu a ka Chineke ga-esi tie gị, gị mgbidi e tere nzu. Ụdị onye ikpe dị aṅaa ka ị bụ i ji na-emebi iwu nʼonwe gị site nʼinye iwu ka e si otu a tie m ihe?”
4Ndị guzo ya nso sịrị, “Ị na-ekwutọ onyeisi nchụaja Chineke?”
5Ma Pọl sịrị, “Aghọtaghị m, ụmụnna m na ọ bụ onyeisi nchụaja. Nʼihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, ‘Ekwula okwu ọjọọ ọbụla megide onye na-achị ndị nke gị.’”
6Mgbe Pọl chọpụtara na otu ụzọ nʼime nzukọ ahụ bụ ndị otu Sadusii, ebe ndị ọzọ bụkwa ndị Farisii, o tiri mkpu nʼime nnọkọ ahụ sị, “Ụmụnna m, abụ m onye Farisii na nwa ndị Farisii. A na-ekpe m ikpe taa nʼihi olileanya m nwere na mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ.”
7Mgbe o kwusiri nke a esemokwu dapụtara nʼetiti ndị Farisii na ndị Sadusii. Ọgbakọ ahụ kewara.