1Mgbe Pọl legidere ndị nzukọ a anya, ọ sịrị, “Ụmụnna m, mụ onwe m ejirila ezi akọnuche bie ndụ m niile nʼihu Chineke ruokwa ụbọchị taa.”
2Nke a mere, Ananayas onyeisi nchụaja nyere iwu ka ndị nọ ya nso tie ya aka nʼọnụ.
3Ma Pọl, sịrị ya, “Otu a ka Chineke ga-esi tie gị, gị mgbidi e tere nzu. Ụdị onye ikpe dị aṅaa ka ị bụ i ji na-emebi iwu nʼonwe gị site nʼinye iwu ka e si otu a tie m ihe?”
4Ndị guzo ya nso sịrị, “Ị na-ekwutọ onyeisi nchụaja Chineke?”
5Ma Pọl sịrị, “Aghọtaghị m, ụmụnna m na ọ bụ onyeisi nchụaja. Nʼihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, ‘Ekwula okwu ọjọọ ọbụla megide onye na-achị ndị nke gị.’”