10Mgbe gọvanọ feere ya aka ka o kwuo okwu, Pọl zara, “amaara m na ị bụ onye ọkaikpe nke mba a ogologo mgbe. Nke a na-enye m obi ụtọ ịgọpụ onwe m nʼihu gị.
11Ị pụrụ ịchọpụta na o rubeghị ụbọchị iri na abụọ kemgbe m rigooro nʼụlọnsọ ukwu na Jerusalem ife ofufe.
12Ha ahụghị m ka mụ na onye ọbụla na-arụrịta ụka nʼụlọnsọ, maọbụ na o nwere ebe m kpatara ọgbaaghara nʼime ụlọ nzukọ, maọbụ ebe ọbụla nʼime obodo.
13Ha enwekwaghị ihe ọbụla ha ga-eji kwagide ama ha na-agba megide m.
14Agaghị m agọ agọ nʼihu gị na m na-ekpere Chineke nke nna anyị ha, dịka onye na-eso Ụzọ ahụ ha na-akpọ otu. Ekwenyere m ihe niile dịka usoro nke iwu si dị, na nke e dere nʼakwụkwọ ndị amụma.