25Ma mgbe ọ gara nʼihu na-ekwu ihe banyere ezi omume na mkpa ọ dị mmadụ ijide onwe ya aka, ya na ihe banyere ụbọchị ikpe nke na-abịa nʼoge ikpeazụ, egwu jidere Feliks. Ọ sịrị, “I nwere ike ịpụ ugbu a. Aga m akpọkwa gị nʼoge ọzọ mgbe m nwetara ohere.”
26Ọ na-atụkwa anya na Pọl ga-enye ya ego. Ya mere o jiri na-eziga ka a na-akpọ ya site nʼoge ruo nʼoge ka ya na ya na-akparịta ụka.
27Mgbe afọ abụọ gasịrị, onye a na-akpọ Pọshiọs Festọs nọchiri anya Feliks. Ma ebe ọ chọrọ inweta ihuọma nʼaka ndị Juu, Feliks hapụrụ Pọl nʼụlọ mkpọrọ.