Ọrụ Ndị Ozi 25

Mgbe ụbọchị atọ gasịrị site nʼoge Festọs bịara na mpaghara ọchịchị ya, o sitere Sizaria garuo Jerusalem.

Acts 25:1 (UKJV) Now when Festus was come into the province, after three days he ascended from Caesarea to Jerusalem.

1Mgbe ụbọchị atọ gasịrị site nʼoge Festọs bịara na mpaghara ọchịchị ya, o sitere Sizaria garuo Jerusalem.

2Nʼebe ahụ ka ndịisi nchụaja na ndịisi ndị Juu kọwara ya ihe banyere Pọl.

3Ha rịọkwara ya nʼamara ọ ga-emere ha bụ ime ka Pọl bịa na Jerusalem. Nʼihi na ha agbaala izu igbu ya nʼụzọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.