15Mgbe m gara Jerusalem, ndịisi nchụaja na ndị okenye ndị Juu gwara m banyere ya. Ha rịọkwara ka m maa ya ikpe.
16“Ma emere m ka ha ghọta na o megidere iwu ndị Rom ịrara mmadụ ọbụla nye tupu ekpee ya ikpe nyekwa ya ohere ịgọrọ onwe ya nʼihu ndị na-ebo ya ebubo.
17Nʼihi nke a, mgbe ha bịara nʼebe a, atụfughị m oge ọbụla, kama nʼụbọchị nke ọzọ ya, anọdụrụ m nʼoche ikpe, nye ikike ka a kpọbata nwoke ahụ.
18Mgbe ndị na-ebo ya ebubo biliri, ọ dịghị otu nʼime ụrụ ala ndị m chere ha ga-akpọ aha nke ha gụpụtara na o mere.
19Okwu ha niile bụ ịrụ ụka banyere okpukpe ha, na banyere otu onye ọzọ a na-akpọ Jisọs onye nwụrụ, onye Pọl na-ekwusịkwa ike na ọ dị ndụ.