17Nʼihi nke a, mgbe ha bịara nʼebe a, atụfughị m oge ọbụla, kama nʼụbọchị nke ọzọ ya, anọdụrụ m nʼoche ikpe, nye ikike ka a kpọbata nwoke ahụ.
18Mgbe ndị na-ebo ya ebubo biliri, ọ dịghị otu nʼime ụrụ ala ndị m chere ha ga-akpọ aha nke ha gụpụtara na o mere.
19Okwu ha niile bụ ịrụ ụka banyere okpukpe ha, na banyere otu onye ọzọ a na-akpọ Jisọs onye nwụrụ, onye Pọl na-ekwusịkwa ike na ọ dị ndụ.
20Ọ rara m ahụ imedo okwu dị otu a. Nʼihi ya, a jụrụ m ya ma ọ ga-amasị ya ị ga nʼụlọikpe dị na Jerusalem ka ọ nọrọ nʼebe ahụ gọrọ onwe ya.
21Ma Pọl rịọrọ ka e debe ya nʼụlọ mkpọrọ ruo mgbe Siza nʼonwe ya ga-ekpebi ikpe ya. Ya mere, ezighachiri m ya nʼụlọ mkpọrọ tutu ruo mgbe m jikeere izigara ya Siza.”