3Ha rịọkwara ya nʼamara ọ ga-emere ha bụ ime ka Pọl bịa na Jerusalem. Nʼihi na ha agbaala izu igbu ya nʼụzọ.
4Ma Festọs zara, “Pọl nọ dịka onye mkpọrọ na Sizaria. Ebe ahụ ka mụ onwe m ga-alaghachi na mgbe na-adịghị anya.
5Ya mere, ka ndịisi unu ji ikike soro m gaa, boo nwoke ahụ ebubo ma ọ bụrụ na o nwere ihe ọjọọ o mere.”
6Ọ nọnyeere ha ihe dịka ụbọchị asatọ maọbụ ụbọchị iri, tupu ọ laghachi na Sizaria. Nʼụbọchị so ya, ọ nọdụrụ nʼoche ikpe, nye ikike ka a kpọpụta Pọl.
7Mgbe ọ bịaruru, ndị Juu sitere Jerusalem bịa gbara ya gburugburu na-ekwu ọtụtụ ihe megide ya nke ha na-enweghị ike ịkọwa.