5Ya mere, ka ndịisi unu ji ikike soro m gaa, boo nwoke ahụ ebubo ma ọ bụrụ na o nwere ihe ọjọọ o mere.”
6Ọ nọnyeere ha ihe dịka ụbọchị asatọ maọbụ ụbọchị iri, tupu ọ laghachi na Sizaria. Nʼụbọchị so ya, ọ nọdụrụ nʼoche ikpe, nye ikike ka a kpọpụta Pọl.
7Mgbe ọ bịaruru, ndị Juu sitere Jerusalem bịa gbara ya gburugburu na-ekwu ọtụtụ ihe megide ya nke ha na-enweghị ike ịkọwa.
8Ma Pọl gọọrọ onwe ya, na-asị, “Ọ dịghị ihe ọjọọ ọbụla m mere megide iwu ndị Juu maọbụ ụlọnsọ, maọbụ Siza.”
9Ma ebe Festọs na-achọ inwe ihuọma nʼebe ndị Juu nọ, ọ sịrị Pọl, “Ị chọrọ ịga Jerusalem ka m kpee gị ikpe nʼebe ahụ?”