6Ọ nọnyeere ha ihe dịka ụbọchị asatọ maọbụ ụbọchị iri, tupu ọ laghachi na Sizaria. Nʼụbọchị so ya, ọ nọdụrụ nʼoche ikpe, nye ikike ka a kpọpụta Pọl.
7Mgbe ọ bịaruru, ndị Juu sitere Jerusalem bịa gbara ya gburugburu na-ekwu ọtụtụ ihe megide ya nke ha na-enweghị ike ịkọwa.
8Ma Pọl gọọrọ onwe ya, na-asị, “Ọ dịghị ihe ọjọọ ọbụla m mere megide iwu ndị Juu maọbụ ụlọnsọ, maọbụ Siza.”
9Ma ebe Festọs na-achọ inwe ihuọma nʼebe ndị Juu nọ, ọ sịrị Pọl, “Ị chọrọ ịga Jerusalem ka m kpee gị ikpe nʼebe ahụ?”
10Ma Pọl sịrị, “Eguzo m nʼụlọikpe Siza nʼonwe ya, ebe e kwesiri ka a nọdụ kpee m ikpe. Ọ dịghị ihe ọjọọ ọbụla m mere ndị Juu, dịka ị maara nke ọma.