8Gịnị mere unu jiri na-eche na ọ rara Chineke ahụ ime ka ndị nwụrụ anwụ site nʼọnwụ bilie?
9“Na mbụ, anara m eche na apụrụ m imeso aha Jisọs onye Nazaret mmeso ọjọọ niile.
10Otu a ka m mere na Jerusalem. Ọ bụghị naanị na m natara ikike nʼaka ndịisi nchụaja jiri ya kpọchie ọtụtụ ndị nsọ nʼụlọ mkpọrọ, ewelikwara m aka elu nʼoge a na-ama ha ikpe ọnwụ.
11Ọtụtụ mgbe ka m hụrụ na a tara ha ahụhụ nʼụlọ nzukọ niile. Agbalịrị m ịkwagide ha ka ha kwuo arụ ma kwutọkwa okwukwe ha. Nʼihi na iwe m dị ọkụ megide ha, esogburu m ha nʼobodo dị iche iche nke na-abụghị obodo ndị Juu.
12“Nʼihi nke a, a gara m Damaskọs site nʼikike na nkwenye nke ndịisi nchụaja. Anatakwara m ike nʼaka ndịisi nchụaja.