15“Asịrị m, ‘Ị bụ onye, Onyenwe anyị?’ “Onyenwe anyị kwuru, ‘Abụ m Jisọs onye ị na-akpagbu.
16Ugbu a, bilie, kwụrụ ọtọ! Nʼihi na-emere m ka ị hụ m anya, ka m họpụta gị ka ị bụrụ onyeozi m na onye akaebe m. Ị ga-emekwa ka ụwa niile mara ihe banyere nzute a i zutere m taa, na ọtụtụ mgbe ọzọ m ga-ezute gị.
17Aga m azọpụta gị site nʼaka ndị nke gị na sitekwa nʼaka ndị mba ọzọ, ndị m na-eziga gị ka i jekwuru.
18Imeghe anya ha mee ka ha si nʼọchịchịrị lọghachi banye nʼìhè, sikwa nʼike nke ekwensu lọghachikwute Chineke. Ka ha site nʼokwukwe ha nwere nʼebe m nọ nata mgbaghara mmehie ha, ketakwa oke ahụ dị ngọzị nʼetiti ndị e doro nsọ.’
19“Ya mere, eze Agripa, enupughị m isi nʼọhụ nke eluigwe ahụ.