Ọrụ Ndị Ozi 26

“Ya mere, eze Agripa, enupughị m isi nʼọhụ nke eluigwe ahụ.

Acts 26:19 (UKJV) Whereupon, O king Agrippa, I was not disobedient unto the heavenly vision:

17Aga m azọpụta gị site nʼaka ndị nke gị na sitekwa nʼaka ndị mba ọzọ, ndị m na-eziga gị ka i jekwuru.

18Imeghe anya ha mee ka ha si nʼọchịchịrị lọghachi banye nʼìhè, sikwa nʼike nke ekwensu lọghachikwute Chineke. Ka ha site nʼokwukwe ha nwere nʼebe m nọ nata mgbaghara mmehie ha, ketakwa oke ahụ dị ngọzị nʼetiti ndị e doro nsọ.’

19“Ya mere, eze Agripa, enupughị m isi nʼọhụ nke eluigwe ahụ.

20Ebidoro m izisa oziọma a na Damaskọs. Emekwara m otu a na Jerusalem na nʼime Judịa niile na nʼetiti ndị mba ọzọ. Ana m ekwusa mkpa ọ dị ka mmadụ niile nwee nchegharị lọghachikwute Chineke. Ka ha gosikwa nchegharị ha site nʼezi ọrụ nke ha na-arụ.

21Ọ bụ nʼihi nke a ka ndị Juu jiri nwụchie m nʼụlọnsọ ukwu ahụ ma chọsiekwa ụzọ ike ịnapụ m ndụ m.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.