19“Ya mere, eze Agripa, enupughị m isi nʼọhụ nke eluigwe ahụ.
20Ebidoro m izisa oziọma a na Damaskọs. Emekwara m otu a na Jerusalem na nʼime Judịa niile na nʼetiti ndị mba ọzọ. Ana m ekwusa mkpa ọ dị ka mmadụ niile nwee nchegharị lọghachikwute Chineke. Ka ha gosikwa nchegharị ha site nʼezi ọrụ nke ha na-arụ.
21Ọ bụ nʼihi nke a ka ndị Juu jiri nwụchie m nʼụlọnsọ ukwu ahụ ma chọsiekwa ụzọ ike ịnapụ m ndụ m.
22Ma Chineke chebere m mee ka m bụrụ onye dị ndụ taa, ịkọrọ mmadụ niile akụkọ a, ndị ukwu na ndị nta. Ihe m na-ekwu bụkwa ihe ndị amụma na Mosis kwuru na ọ ga-emezu,
23na Kraịst ahụ ga-ahụ ahụhụ, bụrụkwa onye mbụ ga-esi nʼọnwụ bilie, iwetara ndị Juu na ndị mba ọzọ ìhè.”