30Mgbe ahụ eze biliri ọtọ, ya na Festọs na Benaisi nwunye ya na ndị ọzọ niile ya na ha nọ nʼoche.
31Mgbe ha na-apụ, ha kwurịtara nʼonwe ha, “Nwoke a emeghị ihe ọbụla kwesiri ọnwụ maọbụ ịga mkpọrọ.”
32Agripa gwara Festọs, “A gaara a hapụ nwoke a ma ọ bụrụ na o nyefeghị Siza ikpe ya.”