Ọrụ Ndị Ozi 27

Mgbe e kpebiri na anyị ga-eso ụgbọ mmiri gaa Itali, e nyefere Pọl na ndị mkpọrọ ọzọ nʼaka onyeisi na-elekọta ndị mkpọrọ aha ya bụ Juliọs. Ọ bụ ọchịagha nke igwe ndị agha Ọgọstọs.

Acts 27:1 (UKJV) And when it was determined that we should sail into Italy, they delivered Paul and certain other prisoners unto one named Julius, a centurion of Augustus' band.

1Mgbe e kpebiri na anyị ga-eso ụgbọ mmiri gaa Itali, e nyefere Pọl na ndị mkpọrọ ọzọ nʼaka onyeisi na-elekọta ndị mkpọrọ aha ya bụ Juliọs. Ọ bụ ọchịagha nke igwe ndị agha Ọgọstọs.

2Anyị banyere nʼụgbọ sitere Adramitiọm nke na-ejikere ịga nʼọnụ mmiri nke dị nʼakụkụ obodo Eshịa. Anyị nupuru nʼoke osimiri, Arịstakọs, onye Masidonia sitere na Tesalonaịka sokwa anyị nʼije a.

3Nʼechi ya, anyị rutere Saịdọn. Juliọs nwere obiọma nʼebe Pọl nọ. Ọ hapụkwara ya ka o jegharịara onwe ya izute ndị enyi ya. Ndị a lekwara anyị ọbịa nke ọma.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.