5Ha matara kemgbe ogologo oge, ha ga-agbakwa ama, ma ọ bụrụ na ha chọrọ ikwu eziokwu, na site na mbụ e biri m ndụ dịka otu onye so nʼime otu ahụ nke iwu ya dị ike karịchasịa nʼime okpukpe ndị Juu, nke bụ otu ndị Farisii.
6Ma ugbu a, a na-ekpe m ikpe nʼihi na enwere m olileanya na nkwa ahụ Chineke kwere nna nna anyị ochie ha.
7Nkwa nke ebo iri na abụọ niile na-ele anya ịnata mgbe ha na-efe ofufe ehihie na abalị. Eze Agripa, ọ bụ nʼihi olileanya a, gị onye a na-asọpụrụ, ka ndị Juu ji na-ebo m ebubo.
8Gịnị mere unu jiri na-eche na ọ rara Chineke ahụ ime ka ndị nwụrụ anwụ site nʼọnwụ bilie?
9“Na mbụ, anara m eche na apụrụ m imeso aha Jisọs onye Nazaret mmeso ọjọọ niile.