Ọrụ Ndị Ozi 27

Emesịa, anyị jiri ụdọ kee ụgbọ mmiri ahụ ime ka o sie ike karịa. Ndị na-anya ụgbọ ahụ tụrụ egwu na ikuku ga-eburu ụgbọ anyị gaa nʼọnụ mmiri na-achị ọkụ nke dị na Satis. Ha wedatara akwa e kobere nʼelu, nke na-enyere ikuku aka ibu ụgbọ mmiri. Emesịa, ha sooro ikuku mmiri ahụ na-aga.

Acts 27:17 (UKJV) Which when they had taken up, they used support cables, undergirding the ship; and, fearing lest they should fall into the quicksand, strake sail, and so were driven.

15Ndị na-anya ụgbọ ahụ gbalịsịrị ike na mbụ ichigharị ihu ụgbọ ahụ ka ọ gaa nʼọnụ mmiri, ma ọ pụghị ime. Anyị hapụrụ ya ka o soro ikuku.

16Nʼikpeazụ, anyị kwọọrọ ụgbọ anyị gaa nʼazụ agwa etiti nta a na-akpọ Klọda. Nʼebe ahụ anyị jisiri ike kekwasị ụgbọ nta nke ụgbọ mmiri anyị na-adọkpụ nʼazụ nʼelu ụgbọ mmiri ahụ.

17Emesịa, anyị jiri ụdọ kee ụgbọ mmiri ahụ ime ka o sie ike karịa. Ndị na-anya ụgbọ ahụ tụrụ egwu na ikuku ga-eburu ụgbọ anyị gaa nʼọnụ mmiri na-achị ọkụ nke dị na Satis. Ha wedatara akwa e kobere nʼelu, nke na-enyere ikuku aka ibu ụgbọ mmiri. Emesịa, ha sooro ikuku mmiri ahụ na-aga.

18Mgbe chi bọrọ, dịka osimiri ahụ na-etonye etonye, ndị na-eso ụgbọ bidoro ịtụbasị ngwongwo ndị dị nʼụgbọ ahụ nʼime osimiri.

19Nʼụbọchị nke atọ ha tụbakwara ngwongwo e ji edozi ụgbọ mmiri na ọtụtụ ihe ọbụla nke aka ha ghọtara nʼime osimiri.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.