18Mgbe chi bọrọ, dịka osimiri ahụ na-etonye etonye, ndị na-eso ụgbọ bidoro ịtụbasị ngwongwo ndị dị nʼụgbọ ahụ nʼime osimiri.
19Nʼụbọchị nke atọ ha tụbakwara ngwongwo e ji edozi ụgbọ mmiri na ọtụtụ ihe ọbụla nke aka ha ghọtara nʼime osimiri.
20Mgbe ọtụtụ ụbọchị gara ma ọ dịghị anyanwụ maọbụ kpakpando wapụtaranụ, ma oke ifufe ọjọọ ahụ gara nʼihu na-amagharị, nʼikpeazụ olileanya anyị na a ga-azọpụta anyị gwụsịrị.
21Nʼoge a niile, o nweghị onye ọbụla nri ọbụla bara ọnụ. Ma nʼikpeazụ. Pọl kwụụrụ ọtọ nʼetiti ha sị, “Ndị ikom ibe m, ọ bụrụ na unu gere ntị nʼokwu m na mbụ, anyị agaraghị ahapụ Kriit. Anyị gara agbanarị mbibi na ịla nʼiyi nke a.
22Ma otu ọ dị, ana m arịọ unu, nweenụ obi ike! Nʼihi na o nweghị onye ọbụla nʼime unu a ga-atụfu ndụ ya. Ọ bụ ezie na ụgbọ a ga-emikpu.