Ọrụ Ndị Ozi 27

Ma otu ọ dị, a ga-eburu ụgbọ mmiri anyị buba ya nʼotu agwa etiti.”

Acts 27:26 (UKJV) Nevertheless we must be cast upon a certain island.

24ọ sịrị, ‘Atụla egwu Pọl, nʼihi na ị ghaghị iguzo nʼihu Siza. Nke ọzọkwa, Chineke emeela amara nye gị ndụ ndị a niile gị na ha so nʼụgbọ eme njem.’

25Ya mere, ndị ikom nweenụ obi ike! Nʼihi na enwere m ntụkwasị obi na Chineke ga-eme dị ka o siri gwa m.

26Ma otu ọ dị, a ga-eburu ụgbọ mmiri anyị buba ya nʼotu agwa etiti.”

27Ihe dịka nʼetiti abalị nʼụbọchị nke iri na anọ ebili mmiri a, mgbe anyị na-erugharị nʼosimiri a na-akpọ Adratik, ndị na-anya ụgbọ chere na ala dị nso.

28Ha tụnyere ụdọ e kenyere igwe nʼọnụ ya nʼime osimiri chọpụta na omimi osimiri ahụ dị narị nzọ ụkwụ na iri abụọ nʼebe ahụ ha nọ. Ha gakwara nʼihu tụọkwa ụdọ ahụ ọzọ chọpụta na omimi osimiri ahụ dị iri nzọ ụkwụ itoolu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.