29Ma egwu juru ha obi nʼihi na ha amaghị ma ha ga-ezute nkume nʼakụkụ ọnụ mmiri ahụ. Ha tụpụtara arịlịka anọ e ji ejide ụgbọ site nʼazụ ụgbọ ahụ ma na-arịọ chi ha maka chi ọbụbọ.
30Mgbe ndị na-eso ụgbọ ahụ kpebiri ịhapụ ya. Ha wedatara ụgbọ epeepe e dobere maka ihe mberede, mee dịka ha na-aga itinye arịlịka nʼọnụ ụgbọ mmiri ahụ.
31Ma Pọl gwara ndị agha na ọchịagha ha okwu, “Ọ bụrụ na ndị a anọgideghị nʼime ụgbọ a, agaghị azọpụta unu.”
32Nʼihi nke a, ndị agha ahụ gbubiri ụdọ e jiri kee ụgbọ epeepe ahụ hapụ ụgbọ epeepe ahụ ka ọ daba nʼime osimiri.
33Mgbe chi bidoro ịbọ, Pọl rịọrọ mmadụ niile ka ha rie nri, na-asị, “Taa mere ya ụbọchị iri na anọ unu nọ na nche, nọgidekwa nʼibu ọnụ, nʼerighị ihe ọbụla.