Ọrụ Ndị Ozi 27

Ndị agha zubere igbu ndị mkpọrọ niile, ka onye ọbụla ghara igwuru mmiri site ya gbafuo.

Acts 27:42 (UKJV) And the soldiers' counsel was to kill the prisoners, lest any of them should swim out, and escape.

40Ha chabisiri arịlịka niile ji ụgbọ ahụ, hapụ ha nʼime osimiri. Otu aka ahụkwa, ha tọpụrụ ụdọ ji ụmara e ji anyagharị ụgbọ. Mgbe ahụ, ha weliri akwa ifufe nke ọnụ ụgbọ nye ifufe, mekwa ka ụgbọ mmiri chee ihu nʼelu ala.

41Ma ụgbọ mmiri ahụ gara maa isi na mkpumkpu aja mmiri, mikpuo nʼaja. Ọnụ ụgbọ ahụ mikpuru nke ukwuu mee ka isi ụgbọ ahụ laa elu, nke a nyere ebili mmiri a ohere iji ike tiwasịa azụ ụgbọ ahụ.

42Ndị agha zubere igbu ndị mkpọrọ niile, ka onye ọbụla ghara igwuru mmiri site ya gbafuo.

43Ma onye ọchịagha ahụ na-ezube ịzọpụta ndụ Pọl, nʼihi ya, o gbochiri ha nʼizuzu ha. Mgbe ahụ o nyere iwu ka ndị niile maara igwu mmiri buru ụzọ si nʼụgbọ ahụ wụba nʼime mmiri, gwuru mmiri gaa nʼelu ala.

44Ma ndị fọdụrụ ga-eru nʼelu ala site nʼịghọnye aka na obodobo osisi maọbụ nʼihe ndị ọzọ dị iche iche si nʼahụ ụgbọ ahụ dapụta. Nʼụzọ dị otu ka mmadụ niile ji bụrụ ndị rutere nʼelu ala nʼudo.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.