Ọrụ Ndị Ozi 27

Ma ụgbọ mmiri ahụ gara maa isi na mkpumkpu aja mmiri, mikpuo nʼaja. Ọnụ ụgbọ ahụ mikpuru nke ukwuu mee ka isi ụgbọ ahụ laa elu, nke a nyere ebili mmiri a ohere iji ike tiwasịa azụ ụgbọ ahụ.

Acts 27:41 (UKJV) And falling into a place where two seas met, they ran the ship aground; and the front part stuck fast, and remained immoveable, but the hinder part was broken with the violence of the waves.

39Mgbe chi bọrọ, ha enwekwaghị ike ịghọta akụkụ mmiri nke ha nọ nʼime ya. Ma ha hụrụ obosara ala nta nke nwere ọnụ mmiri. Ha gbara izu ịchọpụta ma ọ ga-ekwe mee ka ụgbọ mmiri ahụ site nʼebe ahụ gafee.

40Ha chabisiri arịlịka niile ji ụgbọ ahụ, hapụ ha nʼime osimiri. Otu aka ahụkwa, ha tọpụrụ ụdọ ji ụmara e ji anyagharị ụgbọ. Mgbe ahụ, ha weliri akwa ifufe nke ọnụ ụgbọ nye ifufe, mekwa ka ụgbọ mmiri chee ihu nʼelu ala.

41Ma ụgbọ mmiri ahụ gara maa isi na mkpumkpu aja mmiri, mikpuo nʼaja. Ọnụ ụgbọ ahụ mikpuru nke ukwuu mee ka isi ụgbọ ahụ laa elu, nke a nyere ebili mmiri a ohere iji ike tiwasịa azụ ụgbọ ahụ.

42Ndị agha zubere igbu ndị mkpọrọ niile, ka onye ọbụla ghara igwuru mmiri site ya gbafuo.

43Ma onye ọchịagha ahụ na-ezube ịzọpụta ndụ Pọl, nʼihi ya, o gbochiri ha nʼizuzu ha. Mgbe ahụ o nyere iwu ka ndị niile maara igwu mmiri buru ụzọ si nʼụgbọ ahụ wụba nʼime mmiri, gwuru mmiri gaa nʼelu ala.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.