Ọrụ Ndị Ozi 28

Ha wetaara anyị ọtụtụ ihe onyinye. Mgbe oge ịnyapụ ụgbọ anyị ruru, ha nyere anyị ọtụtụ ihe dị anyị mkpa nke pụrụ idu anyị nʼije ahụ.

Acts 28:10 (UKJV) Who also honoured us with many honours; and when we departed, they laded us with such things as were necessary.

8Nʼoge ahụ, nna Pobilios nwere ahụ ọkụ na afọ ọsịsa, Pọl banyere nʼime obodo gaa leta ya, kpeere ya ekpere, bikwasịkwa ya aka. Ahụ dịkwara ya mma.

9Mgbe nke a mechara, ndị niile nwere nrịa nrịa nʼagwa etiti ahụ bịakwara, a gwọkwara ha.

10Ha wetaara anyị ọtụtụ ihe onyinye. Mgbe oge ịnyapụ ụgbọ anyị ruru, ha nyere anyị ọtụtụ ihe dị anyị mkpa nke pụrụ idu anyị nʼije ahụ.

11Anyị nọrọ ihe dịka ọnwa atọ nʼoge oyi, nʼagwa etiti ahụ tutu anyị anyalie ụgbọ. Ọ bụ ụgbọ ndị Alegzandria nke bu ihe a tụrụ atụ a na-akpọ ejima, bụ chi Kastọ na Polụkus.

12Anyị bịaruru obodo Sirakọs ebe anyị nọrọ ụbọchị atọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.