13Site nʼebe ahụ, anyị gara gburugburu tutu rute Rejiọm. Mgbe otu ụbọchị gafere, ikuku bidoro ife site na ndịda. Nʼụbọchị nke abụọ ya, anyị rutere Pọteọlị.
14Nʼebe a anyị chọpụtara ndị kwere ekwe ndị rịọrọ ka anyị nọnyere ha ụbọchị asaa. Site nʼebe a, anyị rutere Rom.
15Mgbe ụmụnna anyị nọ nʼebe ahụ nụrụ na anyị na-abịa. Ha pụtara zute anyị nʼụzọ Apiọs na nʼụlọ ndị Ije atọ. Mgbe Pọl hụrụ ha, o kelere Chineke ma bụrụ onye a gbara ume.
16Mgbe anyị bịaruru Rom, e nyere Pọl ohere ibiri onwe ya dịka o si chọọ nʼebe masịrị ya. Ma otu onye agha na-eche ya nche.
17Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, ọ kpọrọ ndịisi ndị Juu. Mgbe ha zukọrọ, ọ gwara ha, “Ụmụnna m, ọ dịghị ihe ọjọọ ọbụla m mere megide ndị nke anyị, maọbụ megide omenaala nna nna anyị ha, ha jidere m na Jerusalem were m nyefee m nʼaka ndị Rom.