19Ma mgbe ndị Juu jụrụ, ahụrụ m na ọ dị mkpa ibutere Siza ikpe m. Ma o nweghị ihe ọjọọ m bu nʼuche megide ndị obodo m.
20Nʼihi nke a, ka m jiri rịọọ ka mụ na unu hụ ma kwurịtakwa okwu. Ọ bụ nʼihi olileanya nke Izrel ka e ji kee m nʼagbụ igwe a.”
21Ha sịrị, “Anyị anataghị akwụkwọ ozi ọbụla site na Judịa banyere gị. Ọ dịghịkwa ụmụnna anyị ọbụla nke si ebe ahụ bịa nke kọrọ maọbụ kwuo okwu ọjọọ ọbụla banyere gị.
22Otu ọ dị, anyị ga-achọ ịnụta ihe i chere, nʼihi na anyị maara na a na-ekwujọ otu a nʼebe niile.”
23Ha yiri agba mgbe ha na ya ga-ezukọta nʼụbọchị ọzọ. Ọtụtụ mmadụ karịrị bịara nʼụlọ ebe ọ na-anọ. Ọ gbara ama banyere alaeze Chineke site nʼakwụkwọ iwu Mosis na nke ndị amụma, ọ gbalịrị ime ka ha kwenye nʼihe banyere Jisọs. O bidoro izi ha ihe site nʼụtụtụ ruo anyasị.