24Ụfọdụ ka e mere ka ha kweere, ma ụfọdụ mechiri ntị ha na obi ha.
25Ha nwe nghọtahie nʼetiti onwe ha ma malite ịla mgbe Pọl kwusiri okwu nke ikpeazụ a, “Mmụọ Nsọ Chineke kwuru eziokwu mgbe o sitere nʼọnụ Aịzaya onye amụma kwuo okwu nye nna nna anyị ha,
26“ ‘Jekwuru ndị a gwa ha okwu, “Unu ga na-anụ, nụkwa, ma unu agaghị aghọta ihe ọbụla, unu ga na-ele anya, hụkwa, ma unu agaghị ahụ ihe ọbụla.”
27Nʼihi na obi ndị a amaala abụba, dịkwa arọ; ha adịghị ejikwa ntị ha anụ ihe, ha mechikwara anya ha ka ha ghara ịhụ ụzọ. Ma ọ bụghị otu a, ha nwere ike iji anya ha hụ ụzọ, jirikwa ntị ha nụ ihe sitekwa nʼobi ha nwe nghọta ma chigharịa bịakwute m, ka m gwọọ ha.’
28“Ya mere, a chọrọ m ka unu ghọta na nzọpụta a nke si nʼaka Chineke bịa, dịkwa nye ndị mba ọzọ, ha ga-egekwa ntị.”