28“Ya mere, a chọrọ m ka unu ghọta na nzọpụta a nke si nʼaka Chineke bịa, dịkwa nye ndị mba ọzọ, ha ga-egekwa ntị.”
29Mgbe o kwusiri nke a, ndị Juu ahụ lara na-arụrịta ụka nke ukwu nʼetiti onwe ha.
30O biri obi nke onwe ya afọ abụọ nʼụlọ ọ na-akwụ ụgwọ ya. Ọ na-anabatakwa ndị niile bịara ileta ya,
31o ji mkwuwa okwu na-ekwusa ihe banyere alaeze Chineke na-akụzikwa ihe banyere Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ọ dịkwaghị onye ọbụla gbalịrị igbochi ya.