Ọrụ Ndị Ozi 28

Ma Pọl fepụrụ agwọ ahụ nʼaka ya, mee ka ọ daba nʼọkụ, ọ dịghịkwa ihe mere ya.

Acts 28:5 (UKJV) And he shook off the beast into the fire, and felt no harm.

3Nʼoge Pọl na-achịkọta nkụ itinye nʼọkụ a, otu agwọ ajụala sitere nʼime nkụ na-enwu ọkụ mapụta nʼihi okpomọkụ tụhịkọ onwe ya nʼaka ya.

4Mgbe ndị obodo ahụ hụrụ agwọ ahụ ka ọ tụhịkọtara onwe ya nʼaka ya, ha gwarịtara onwe ha, “nʼezie a, nwoke a bụ ogbu mmadụ, a naghị eji ọkụ enyo ya. Ọ bụ ezie na azọpụtara ya site oke mmiri, ma ikpe ziri ezi ekweghị ka ọ dị ndụ.”

5Ma Pọl fepụrụ agwọ ahụ nʼaka ya, mee ka ọ daba nʼọkụ, ọ dịghịkwa ihe mere ya.

6Ha na-ele anya ma aka ya ọ ga-aza, maọbụ na ọ ga-ada nwụọ. Ma mgbe ha chegidere hụ na o nweghị ihe mere ya, ha gbanwere obi ha bido na-ekwu, na ọ bụ chi.

7Na nso ọnụ mmiri a ebe anyị kwụsịrị, otu ubi dị ya. Ọ bụ ubi Pobilios otu nwoke onyeisi na-achị agwa etiti ahụ. Ọ nabatara anyị nke ọma, lee anyị ọbịa ụbọchị atọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.