4Mgbe ndị obodo ahụ hụrụ agwọ ahụ ka ọ tụhịkọtara onwe ya nʼaka ya, ha gwarịtara onwe ha, “nʼezie a, nwoke a bụ ogbu mmadụ, a naghị eji ọkụ enyo ya. Ọ bụ ezie na azọpụtara ya site oke mmiri, ma ikpe ziri ezi ekweghị ka ọ dị ndụ.”
5Ma Pọl fepụrụ agwọ ahụ nʼaka ya, mee ka ọ daba nʼọkụ, ọ dịghịkwa ihe mere ya.
6Ha na-ele anya ma aka ya ọ ga-aza, maọbụ na ọ ga-ada nwụọ. Ma mgbe ha chegidere hụ na o nweghị ihe mere ya, ha gbanwere obi ha bido na-ekwu, na ọ bụ chi.
7Na nso ọnụ mmiri a ebe anyị kwụsịrị, otu ubi dị ya. Ọ bụ ubi Pobilios otu nwoke onyeisi na-achị agwa etiti ahụ. Ọ nabatara anyị nke ọma, lee anyị ọbịa ụbọchị atọ.
8Nʼoge ahụ, nna Pobilios nwere ahụ ọkụ na afọ ọsịsa, Pọl banyere nʼime obodo gaa leta ya, kpeere ya ekpere, bikwasịkwa ya aka. Ahụ dịkwara ya mma.