Ọrụ Ndị Ozi 3

Otu ụbọchị Pita na Jọn na-aga nʼụlọnsọ ukwu ikpe ekpere nʼoge ekpere nʼelekere atọ nke ehihie.

Acts 3:1 (UKJV) Now Peter and John went up together into the temple at the hour of prayer, being the ninth hour.

1Otu ụbọchị Pita na Jọn na-aga nʼụlọnsọ ukwu ikpe ekpere nʼoge ekpere nʼelekere atọ nke ehihie.

2Ma otu nwoke dara ngwụrọ site nʼafọ nne ya ka a na-ebute nʼọnụ ụzọ ama nke ụlọnsọ ukwu ahụ ụbọchị niile ka ọ na-arịọ ndị na-aba nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ arịrịọ. Aha ọnụ ụzọ ama ahụ bụ ọnụ ụzọ ama ọma.

3Mgbe ọ hụrụ Pita na Jọn ka ha na-achọ ịba nʼụlọnsọ ukwu ahụ, o bidoro ịrịọ ha arịrịọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.