Ọrụ Ndị Ozi 3

Ma dị ka o jidere Pita na Jọn aka, ndị mmadụ niile jiri mgbagwoju anya gbara ọsọ bịakwute ha nʼakụkụ ụlọnsọ ahụ ebe a na-akpọ mgbe ụlọ Solomọn.

Acts 3:11 (UKJV) And as the lame man which was healed held Peter and John, all the people ran together unto them in the porch that is called Solomon's, greatly wondering.

9Mmadụ niile hụrụ ya ka ọ na-agagharị na-eto Chineke,

10ha ghọtara na ọ bụ ya bụ onye ahụ na-anọ nʼọnụ ụzọ ama ụlọnsọ ukwu ahụ, nke a na-akpọ ọnụ ụzọ ama ọma na-arịọ arịrịọ. Ọ gbagwojuru ha anya nke ukwuu, gbakwa ha gharịị ihe mere ya.

11Ma dị ka o jidere Pita na Jọn aka, ndị mmadụ niile jiri mgbagwoju anya gbara ọsọ bịakwute ha nʼakụkụ ụlọnsọ ahụ ebe a na-akpọ mgbe ụlọ Solomọn.

12Mgbe Pita hụrụ nke a, ọ gwara igwe mmadụ ahụ, “Ndị Izrel, gịnị mere ihe a ji eju unu anya? Gịnị mere unu ji ele anyị anya dịka a ga-asị na ọ bụ site nʼike nke anyị maọbụ nʼịdị nsọ anyị ka anyị jiri mee ka nwoke a gawa ije?

13Chineke nke Ebraham, nke Aịzik na nke Jekọb, Chineke nke nna anyị ha, ebuliela onye na-ejere ya ozi, bụ Jisọs elu, onye unu nyefere ka e gbuo, ma gọnarịkwa ya nʼihu Pailet, nʼagbanyeghị na o kpebiri ịhapụ ya ka ọ laa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.