Ọrụ Ndị Ozi 3

Unu gọnarịrị onye ahụ dị nsọ bụrụkwa onye ezi omume, ma rịọ ka a hapụrụ unu ogbu mmadụ.

Acts 3:14 (UKJV) But all of you denied the Holy One and the Just, and desired a murderer to be granted unto you;

12Mgbe Pita hụrụ nke a, ọ gwara igwe mmadụ ahụ, “Ndị Izrel, gịnị mere ihe a ji eju unu anya? Gịnị mere unu ji ele anyị anya dịka a ga-asị na ọ bụ site nʼike nke anyị maọbụ nʼịdị nsọ anyị ka anyị jiri mee ka nwoke a gawa ije?

13Chineke nke Ebraham, nke Aịzik na nke Jekọb, Chineke nke nna anyị ha, ebuliela onye na-ejere ya ozi, bụ Jisọs elu, onye unu nyefere ka e gbuo, ma gọnarịkwa ya nʼihu Pailet, nʼagbanyeghị na o kpebiri ịhapụ ya ka ọ laa.

14Unu gọnarịrị onye ahụ dị nsọ bụrụkwa onye ezi omume, ma rịọ ka a hapụrụ unu ogbu mmadụ.

15Unu gburu onye ahụ na-enye ndụ, ma Chineke akpọlitela ya site nʼọnwụ. Anyị bụ ndị akaebe ihe ndị a.

16Ọ bụ site nʼokwukwe nʼaha ya, ọ bụ aha ya naanị mere nwoke a ka ọ dị ike onye nke unu na-ahụ ma marakwa. Okwukwe nʼime Jisọs mere ka ahụ ya zuo oke nʼihu unu niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.