14Unu gọnarịrị onye ahụ dị nsọ bụrụkwa onye ezi omume, ma rịọ ka a hapụrụ unu ogbu mmadụ.
15Unu gburu onye ahụ na-enye ndụ, ma Chineke akpọlitela ya site nʼọnwụ. Anyị bụ ndị akaebe ihe ndị a.
16Ọ bụ site nʼokwukwe nʼaha ya, ọ bụ aha ya naanị mere nwoke a ka ọ dị ike onye nke unu na-ahụ ma marakwa. Okwukwe nʼime Jisọs mere ka ahụ ya zuo oke nʼihu unu niile.
17“Ugbu a ụmụnna m, amaara m na unu kpara agwa na-amaghị ama, dịka ndị ndu unu sikwara kpaa.
18Ma Chineke siri otu a mezuo ihe o kwuru site nʼọnụ ndị amụma niile na Kraịst ya aghaghị ịhụ ahụhụ.